Aịzaya 53:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+ Matiu 27:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ma ọ zaghị ya ihe ọ bụla, ee e, ọbụna otu mkpụrụ okwu, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu.+ Jọn 19:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 o wee banye ọzọ n’obí gọvanọ, sị Jizọs: “Ebee ka i si bịa?” Ma Jizọs azaghị ya ihe ọ bụla.+
7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+
14 Ma ọ zaghị ya ihe ọ bụla, ee e, ọbụna otu mkpụrụ okwu, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu.+