7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+
10 Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.+ O mere ka ọ rịa ọrịa.+ Ọ bụrụ na ị ga-eme ka mkpụrụ obi ya bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ọ ga-ahụ ụmụ ya,+ ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.+ Ihe na-atọ Jehova ụtọ+ ga-aga nke ọma+ n’aka ya.