10 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na a ga-enwe mgbọrọgwụ Jesi+ nke ga-eguzo ọtọ dị ka ihe mgbaàmà dịịrị ndị dị iche iche.+ Ọ bụkwa ya ka ọbụna mba niile ga-echigharịkwuru ma jụọ ase.+ Ebe izu ike ya ga-adịkwa ebube.+
6 “Mụ onwe m, Jehova, akpọwo gị n’ezi omume,+ m wee sere gị n’aka.+ M ga-echebe gị, meekwa ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị mmadụ,+ bụrụkwa ìhè nke mba niile,+
6 O wee sị: “Ọ bụghịrị gị obere ihe na ị ga-abụ ohu m iji mee ka ebo niile nke Jekọb bilie nakwa iji kpọghachite ndị Izrel e chebere echebe.+ Enyewokwa m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba niile,+ ka nzọpụta m wee ruo nsọtụ ụwa.”+