Diuterọnọmi 15:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+ Ilu 3:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Ajụla imere ha ihe ọma bụ́ ndị e kwesịrị imere ya,+ mgbe ọ dị n’ike aka gị ime ya.+ Ilu 21:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Ogologo ụbọchị dum ka agụụ na-agụsi ya ike, ma onye ezi omume na-enye ihe, ọ dịghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+ Matiu 5:42 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 42 Mmadụ rịọ gị ihe, nye ya, agbakụtakwala onye chọrọ ibite gị ihe n’akwụghị ọmụrụ nwa azụ.+
7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+
26 Ogologo ụbọchị dum ka agụụ na-agụsi ya ike, ma onye ezi omume na-enye ihe, ọ dịghịkwa ihe ọ na-ajụ inye.+