34 Simiọn gọzikwara ha, gwakwa Meri bụ́ nne ya, sị: “Lee! E debere onye a ka ọ bụrụ ihe ga-akpata ọdịda+ na mbili nke ọtụtụ ndị n’Izrel+ nakwa ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama nke a ga-ekwutọ+
19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya.+ Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa,+ kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+