Luk
2 N’ụbọchị ndị ahụ, Siza Ọgọstọs tiri iwu+ ka e deba aha elu ụwa dum mmadụ bi n’akwụkwọ; 2 (ndeba aha mbụ a e debara n’akwụkwọ bụ mgbe Kwiriniọs bụ gọvanọ Siria;) 3 mmadụ niile wee gaa ka e deba aha ha n’akwụkwọ,+ onye ọ bụla n’obodo nke ya. 4 Ya mere, Josef sikwa na Galili gawa, hapụ obodo Nazaret, banye Judia, n’obodo Devid, nke a na-akpọ Betlehem,+ n’ihi na o si n’ụlọ nakwa n’ezinụlọ Devid,+ 5 ka e wee deba aha ya na Meri n’akwụkwọ,+ bụ́ onye ọ lụworo.+ Nwaanyị a dịkwa ime ọmụmụ ugbu a.+ 6 Ka ha nọ n’ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ruru. 7 O wee mụọ nwa ya nwoke, bụ́ nwa mbụ ya,+ o wee jiri ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ime ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri,+ n’ihi na ọ dịghị ebe ha ga-anọ n’ụlọ ndị njem.
8 N’otu obodo ahụkwa, e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị. 9 Na mberede, mmụọ ozi+ Jehova guzoro ha n’akụkụ, ebube+ Jehova nwuru dị ka ìhè gburugburu ha, oké egwu wee jide ha. 10 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha: “Unu atụla egwu, n’ihi na, lee! ana m ezisara unu ozi ọma banyere oké ọṅụ nke ndị niile ga-enwe,+ 11 n’ihi na a mụụrụ unu Onye Nzọpụta taa,+ onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị,+ n’obodo Devid.+ 12 Nke a ga-abụkwara unu ihe ịrịba ama: unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e ji ákwà fụọ, nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.” 13 Na mberede, ndị mmụọ ozi bịakwutere mmụọ ozi ahụ n’ìgwè dị ka ụsụụ ndị agha,+ na-eto Chineke,+ sị: 14 “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kasị elu,+ ka udo+ dịkwa n’elu ụwa n’etiti ndị Chineke meere amara.”+
15 Ya mere, mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha wee banye n’eluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ malitere ịgwa ibe ha, sị: “Ka anyị garuo Betlehem ozugbo ma hụ ihe a merenụ, dị ka Jehova+ mere ka anyị mara.” 16 Ha gara ngwa ngwa hụ Meri na Josef nakwa nwa ọhụrụ ahụ nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. 17 Mgbe ha hụrụ ya, ha mere ka a mara ihe a gwara ha banyere nwatakịrị a. 18 Ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọọrọ ha jukwara ndị niile nụrụ ya anya, 19 ma Meri buuru okwu a niile n’obi ya, na-eche ihe ihe ndị a pụtara.+ 20 Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ wee laghachi, na-enye Chineke otuto ma na-aja ya mma maka ihe niile ha nụrụ ma hụ, dị nnọọ ka a kọọrọ ha.
21 Mgbe ụbọchị asatọ+ zuru ka e bie ya úgwù,+ a gụrụ ya Jizọs,+ bụ́ aha mmụọ ozi ahụ kpọrọ ya tupu a tụrụ ime ya.+
22 Mgbe o ruru ụbọchị a ga-eme ka ha dị ọcha+ dị ka iwu Mozis si dị, ha kuuru ya gaa Jeruselem ka ha chee ya n’ihu Jehova, 23 dị nnọọ ka e dere n’iwu Jehova, sị: “A ghaghị ịkpọ nwa nwoke ọ bụla nke meghere akpa nwa onye dị nsọ nye Jehova,”+ 24 nakwa ka ha chụọ àjà dị ka e kwuru n’iwu Jehova: “Nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.”+
25 Ma, lee! e nwere otu nwoke nọ na Jeruselem onye aha ya bụ Simiọn, nwoke a bụ onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke, onye na-echere ngụgụ obi a ga-agụgụ Izrel,+ mmụọ nsọ dịkwa n’ahụ́ ya. 26 Chineke sikwa n’ike mmụọ nsọ kpugheere ya na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst+ nke Jehova. 27 Mmụọ nsọ+ mere ka ọ bata n’ụlọ nsọ; ka ndị mụrụ nwatakịrị ahụ bụ́ Jizọs ku ya bata ka e meere ya ihe a na-eme dị ka iwu ahụ kwuru,+ 28 ya onwe ya kuuru ya n’aka ma gọzie Chineke, sị: 29 “Ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị, ị ga-ahapụ ohu gị ka ọ nwụọ n’udo+ dị ka i kwuru; 30 n’ihi na anya m ahụwo onye ị ga-esi n’aka ya weta nzọpụta,+ 31 bụ́ onye i wepụtara n’ihu mba niile.+ 32 Onye a bụ ìhè+ nke ga-ewepụ ihe kpuchiri anya+ mba niile+ nakwa ebube nke ndị gị bụ́ Izrel.” 33 Nna ya na nne ya nọkwa na-atụgharị uche n’ihe ndị a na-ekwu banyere ya. 34 Simiọn gọzikwara ha, gwakwa Meri bụ́ nne ya, sị: “Lee! E debere onye a ka ọ bụrụ ihe ga-akpata ọdịda+ na mbili nke ọtụtụ ndị n’Izrel+ nakwa ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama nke a ga-ekwutọ+ 35 (ee, a ga-amanye ogologo mma agha n’ime mkpụrụ obi nke gị),+ ka e wee kpughee ihe ọtụtụ obi na-eche.”+
36 E nwekwara Ana onye amụma, bụ́ nwa nwaanyị Fanuel, onye si n’ebo Asha, (nwaanyị a emewo agadi, ya na di ya bikwara afọ asaa malite n’oge ọ na-amaghị nwoke, 37 ọ bụkwa nwaanyị di ya nwụrụ+ nke dị afọ iri asatọ na anọ ugbu a), onye na-adịghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ, ọ na-eje ozi dị nsọ abalị na ehihie,+ na-ebu ọnụ, na-arịọsikwa arịrịọ ike. 38 N’oge awa ahụkwa, ọ bịaruru nso ma malite inye Chineke ekele, na-agwakwa ndị niile na-echere nnapụta Jeruselem+ banyere nwatakịrị ahụ.
39 Ya mere, mgbe ha mechara ihe niile dị ka iwu+ Jehova si dị, ha banyeghachiri Galili wee gaa n’obodo nke ha bụ́ Nazaret.+ 40 Nwatakịrị ahụ nọkwa na-eto eto ma na-agbasi ike,+ jupụtakwa n’amamihe, ọ nọgidekwara na-enwe ihu ọma Chineke.+
41 Ndị mụrụ ya na-aga Jeruselem+ site n’afọ ruo n’afọ maka ememme ngabiga. 42 Mgbe ọ gbara afọ iri na abụọ, ha gara, dị ka a na-eme+ n’oge ememme ahụ, 43 wee nọrọ ruo mgbe e mechara ememme ahụ. Ma mgbe ha na-alọta, nwa okoro ahụ bụ́ Jizọs nọdụrụ na Jeruselem, ma ndị mụrụ ya amaghị. 44 Ebe ha chere na ọ nọ n’etiti ìgwè mmadụ ahụ ndị na-emekọ njem ọnụ, ha gara ihe ruru njem otu ụbọchị+ wee malite ịchọ ya n’etiti ndị ikwu na ndị ha maara. 45 Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jeruselem, na-achọsi ya ike. 46 E mesịa, mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ha chọtara ya n’ụlọ nsọ+ ebe ọ nọ ọdụ n’etiti ndị nkụzi, na-egekwa ha ntị ma na-ajụ ha ajụjụ. 47 Ma nghọta o nwere na ihe ọ na-aza ha nọ na-eju ndị niile na-ege ya ntị anya.+ 48 Mgbe ha hụrụ ya, o juru ha anya, nne ya wee sị ya: “Nwa m, gịnị mere i ji meso anyị otú a? Lee, mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị.” 49 Ma ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”+ 50 Otú ọ dị, ha aghọtaghị okwu ahụ ọ gwara ha.+
51 O wee soro ha gbadaa ma bịaruo Nazaret, ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.+ Nne ya buuru okwu a niile nke ọma n’obi ya.+ 52 Jizọs nọkwa na-eto, na-enwekwu amamihe+ na ihu ọma Chineke na nke ndị mmadụ.+