26 O wee gwa nzukọ ahụ, sị: “Biko, sinụ n’ihu ụlọikwuu ndị ajọ omume a pụọ, unu emetụkwala ihe ọ bụla bụ́ nke ha aka,+ ka e wee ghara ikpochapụ unu n’ihi mmehie ha niile.”
17 Ma ana m agba unu ume, ụmụnna m, ka unu leruo ndị na-akpata nkewa+ anya, tinyere ndị na-akpata ihe ịsụ ngọngọ, nke bụ́ ihe megidere ozizi unu mụtara,+ na-ezenụ ha eze.+
6 Ụmụnna anyị, anyị na-enye unu iwu+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu zere+ nwanna ọ bụla nke na-adịghị agazi agazi,+ nke na-adịghịkwa eso omenala unu natara n’aka anyị.+