Ndị Rom 8:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyị onwe anyị kwa bụ́ ndị nwere mkpụrụ mbụ+ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, ee, anyị onwe anyị na-asụ ude+ n’ime onwe anyị, ebe anyị na-echeresi ike ka e doo anyị dị ka ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị. Ndị Kọlọsi 1:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, ya bụ, mgbaghara nke mmehie anyị.+ 1 Timoti 2:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile+—nke a bụ ihe a ga-agba àmà ya n’oge nke ya.
23 Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama anyị onwe anyị kwa bụ́ ndị nwere mkpụrụ mbụ+ ahụ, ya bụ, mmụọ ahụ, ee, anyị onwe anyị na-asụ ude+ n’ime onwe anyị, ebe anyị na-echeresi ike ka e doo anyị dị ka ụmụ,+ ka e jiri ihe mgbapụta tọhapụ ahụ́ anyị.
6 onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile+—nke a bụ ihe a ga-agba àmà ya n’oge nke ya.