14 M ga-etinye mmụọ m n’ime unu, unu ga-adịkwa ndụ ọzọ,+ m ga-emekwa ka unu biri n’ala unu; unu ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya, meekwa ya,’ ka Jehova kwuru.”+
24 Ya na onye na-edebe ihe o nyere n’iwu dị n’otu, onye ahụ na ya onwe ya dị n’otu;+ anyị jikwa nke a mara na anyị na ya dị n’otu,+ n’ihi mmụọ ya+ nke o nyere anyị.