Abụ Ọma 34:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya,+Ọ na-anapụtakwa ha.+ Abụ Ọma 91:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 N’ihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,+Ka ha chee gị nche n’ụzọ gị niile.+ Matiu 18:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi+ ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.+ Luk 2:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Na mberede, mmụọ ozi+ Jehova guzoro ha n’akụkụ, ebube+ Jehova nwuru dị ka ìhè gburugburu ha, oké egwu wee jide ha. Luk 2:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Na mberede, ndị mmụọ ozi bịakwutere mmụọ ozi ahụ n’ìgwè dị ka ụsụụ ndị agha,+ na-eto Chineke,+ sị: Ọrụ Ndịozi 5:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Ma n’abalị, mmụọ ozi Jehova+ meghere ibo ụzọ nke ụlọ mkpọrọ ahụ,+ kpọpụta ha ma sị: Ọrụ Ndịozi 12:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ma, lee! mmụọ ozi Jehova guzoro nso,+ ìhè nwukwara n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kụtụrụ Pita aka n’akụkụ, kpọtee ya,+ sị: “Bilie ọsọ ọsọ!” Agbụ ígwè e kere ya n’aka wee dapụsịa.+
10 Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta anya; n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi+ ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.+
9 Na mberede, mmụọ ozi+ Jehova guzoro ha n’akụkụ, ebube+ Jehova nwuru dị ka ìhè gburugburu ha, oké egwu wee jide ha.
13 Na mberede, ndị mmụọ ozi bịakwutere mmụọ ozi ahụ n’ìgwè dị ka ụsụụ ndị agha,+ na-eto Chineke,+ sị:
7 Ma, lee! mmụọ ozi Jehova guzoro nso,+ ìhè nwukwara n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kụtụrụ Pita aka n’akụkụ, kpọtee ya,+ sị: “Bilie ọsọ ọsọ!” Agbụ ígwè e kere ya n’aka wee dapụsịa.+