6 n’ebe anyị nọ, otu Chineke dị,+ bụ́ Nna,+ onye ihe niile si n’aka ya dịrị, anyị onwe anyị dịkwaara ya;+ otu Onyenwe anyị dịkwa,+ bụ́ Jizọs Kraịst,+ onye e si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị,+ anyị onwe anyị sikwa n’aka ya.
16 n’ihi na e si n’aka+ ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ịbụisi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike.+ E kere ihe ndị ọzọ niile site n’aka+ ya nakwa maka ya.