24 Ma, ha ekwughị n’obi ha, sị: “Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị,+ Onye na-eme ka e nwee nnukwu mmiri ozuzo na ụbịa mmiri na ụla mmiri n’oge ha,+ Onye na-echekwara anyị izu a kara aka maka owuwe ihe ubi anyị.”+
23 Unu ụmụ Zayọn, ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova bụ́ Chineke unu;+ n’ihi na ọ ghaghị ime ka unu nwee ụbịa mmiri otú o kwesịrị.+ Ọ ga-emekwa ka oké mmiri ozuzo zooro unu, ụbịa mmiri na ụla mmiri, dị ka ọ na-ezo na mbụ.+
10“Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo+ n’oge ụla mmiri,+ rịọnụ Jehova bụ́ onye na-eme ka mmiri ruo n’ígwé ojii,+ onye na-eme ka mmiri zooro ndị mmadụ,+ zooro ahịhịa ndụ ọ bụla dị n’ubi.+