22 N’ihi na Kraịst ụgha na ndị amụma ụgha ga-ebili+ ma mee ihe ịrịba ama na ihe ijuanya+ dị iche iche iji duhie ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+
10 Ya mere, ọ bụrụ na mụ abịa, m ga-echeta ọrụ ya ndị ọ na-arụ,+ na-ekwu okwu ọjọọ banyere anyị.+ Ihe ndị a ejughịkwa ya afọ, ọ dịghịkwa eji nkwanye ùgwù anabata ụmụnna,+ ọ na-anwakwa igbochi+ ndị na-achọ ịnabata+ ha, na-achụpụkwa+ ha n’ọgbakọ.
20 “‘Otú ọ dị, ihe na-adịghị mma i mere bụ na ị gbachiri nwaanyị ahụ bụ́ Jezibel nkịtị,+ bụ́ onye na-akpọ onwe ya onye amụma, ọ na-akụzikwara+ ndị ohu m,+ na-eduhiekwa ha, ka ha na-akwa iko,+ ka ha na-erikwa ihe e ji chụọrọ arụsị àjà.+