18 ana m enye gị ndụmọdụ ka ị zụrụ n’aka m ọlaedo+ e ji ọkụ nụchaa, ka i wee baa ọgaranya, zụrụkwa uwe elu na-acha ọcha, ka i wee yiri uwe, ka e wee ghara ịhụ ọtọ gị,+ ihere ewee mee gị, zụrụkwa ọgwụ anya ị ga-ete n’anya gị+ ka i wee na-ahụ ụzọ.
11 E wee nye onye ọ bụla n’ime ha otu uwe mwụda na-acha ọcha;+ a gwakwara ha ka ha zutụkwuo ike ruo nwa oge, ruo mgbe ọnụ ọgụgụ nke ha na ndị ohu ibe ha na ụmụnna ha ga-ezu ezu, bụ́ ndị a na-aga igbu+ dị ka e gburu ha onwe ha.