-
Jenesis 47:29-31Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Mgbe Izrel ghọtara na oge ọ ga-anwụ eruwela,+ ọ kpọrọ Josef nwa ya, sị ya: “Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m* ma gosi m na ị hụrụ m n’anya* nakwa na ị bụ onye m ga-atụkwasịli obi. Biko, elila m n’Ijipt.+ 30 M nwụọ,* buru ozu m pụọ n’Ijipt gaa lie m n’ebe e liri nna nna m hà.”+ Josef sịrị ya: “M ga-eme nnọọ otú i kwuru.” 31 Izrel sịziri ya: “Ṅụọrọ m iyi.” O wee ṅụọrọ ya iyi.+ Izrel wee chee ihu n’isi àkwà* ya kpọọrọ Chineke isiala.+
-