7 Anyị nọ n’etiti ubi na-eke ọka* n’ùkwù n’ùkwù. Ùkwù ọka nke m wee bilie guzo ọtọ, ùkwù ọka nke unu agbaa ùkwù ọka nke m gburugburu kpọọrọ ya isiala.”+
9 Mgbe e mechara, ọ rọrọ nrọ ọzọ ma kọọrọ ya ụmụnne ya, sị: “Arọrọ m nrọ ọzọ. Ná nrọ a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu nọ na-akpọrọ m isiala.”+