-
Ọpụpụ 29:16-18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Gbuo ebule ahụ ma fesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 17 Gburisịa ebule ahụ. Saa eriri afọ ya+ na ụkwụ ya ma dokọta ibé anụ ahụ niile na isi ya ọnụ. 18 Ị ga-esu ebule ahụ niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma*+ nke a na-esuru Jehova ọkụ. Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ nke a na-achụrụ Jehova.
-
-
Levitikọs 8:18-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Ọ kpụtaziri ebule ahụ e ji achụ àjà a na-esu ọkụ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ebikwasị aka ha n’isi ebule ahụ.+ 19 Mosis wee gbuo ya ma fesa ọbara ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà. 20 E gburisịrị ebule ahụ. Mosis wee suo isi ya, akụkụ ya dị iche iche, na abụba* ya ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 21 E ji mmiri saa eriri afọ ya na ụkwụ ya. Mosis wee suo ebule ahụ niile ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. Ọ bụ àjà e suru ọkụ ka o sie ísì ọma.* Ọ bụ àjà e suru ọkụ a chụụrụ Jehova, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
-
-
Levitikọs 9:12-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 O gbuziri anụ a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ. Ụmụ Erọn ndị nwoke wee bunye ya ọbara ya, ya efesa ya n’akụkụ niile nke ebe ịchụàjà.+ 13 Ha bunyere ya anụ ahụ e gburiri egburi a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ, bunyekwa ya isi ya, ya esuo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà. 14 Ọ sakwara eriri afọ ya na ụkwụ ya ma suo ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ n’elu anụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ nke dị n’ebe ịchụàjà.
-