-
Ọnụ Ọgụgụ 5:14, 15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 Ma di ya ọ̀ na-ekwosa ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbaala n’èzí mgbe nwaanyị ahụ merụrụla onwe ya, ma di ya ọ̀ na-ekwosa ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbaala n’èzí mgbe nwaanyị ahụ na-emerụbeghị onwe ya, 15 nwoke ahụ ga-akpọrọ nwunye ya kpọtara onye nchụàjà, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka bali ọ ga-enye maka nwunye ya. Ọ gaghị awụsa ya mmanụ ma ọ bụ tụkwasị ya frankinsens n’ihi na ọ bụ àjà ọka ekworo, àjà ọka nke na-eme ka e cheta onye ikpe mara.
-