-
Jenesis 48:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Mgbe Josef hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya n’isi Ifrem, ọ dịghị ya mma. N’ihi ya, ọ gbalịrị ka o wepụ aka nna ya n’isi Ifrem ma tụkwasị ya n’isi Manase. 18 Josef sịrị nna ya: “Nna m, ọ dịghị mma otú a, n’ihi na ọ bụ onye nke a bụ ọkpara.+ Bikwasị aka nri gị n’isi ya.” 19 Ma nna ya ekweghị. Ọ sịrị Josef: “Nwa m, ama m, ama m. Yanwa ga-aghọkwa mba, ọ ga-abụkwa onye ukwu. Ma nwanne ya nke nta ga-aka ya.+ Ụmụ* ya ga-adị nnọọ ọtụtụ nke na ha ga-aghọ ọtụtụ mba.”+
-