28“Ị ga-esi ná ndị Izrel kpọta Erọn nwanne gị, ya na ụmụ ya ndị nwoke, ka ha bụrụ ndị nchụàjà m,+ ya bụ, Erọn,+ ya na Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama,+ bụ́ ụmụ Erọn.+
8 “N’oge ahụ, Jehova họpụtara ebo Livaị+ ka ha na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ ka ha nọrọ n’ihu Jehova na-ejere ya ozi, jirikwa aha ya na-agọzi ndị mmadụ,+ otú ha na-eme ruo taa.