-
1 Samuel 18:6-8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ọ na-abụ Devid na ndị agha ndị ọzọ gbuchaa ndị Filistia lọta, ụmụ nwaanyị esi n’obodo niile dị n’Izrel pụta, gụrụ egwú,+ kụrụ obere ịgbà,+ kpọrọ une, ṅụrụ ọṅụ, gbarakwa egwú gaa izute Eze Sọl. 7 Ihe a ka ụmụ nwaanyị ndị a na-enwe aṅụrị na-agụ n’egwú:
“Sọl egbuola puku kwuru puku,
Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku.”+
8 Mgbe Sọl nụrụ egwú a,+ ọ dịghị ya mma. O wekwara ezigbo iwe, na-agwa onwe ya, sị: “Ha na-eto Devid na-asị na o gburu iri puku kwuru iri puku, ma na-eto m na-asị na m gburu puku kwuru puku. Naanị ihe fọziri bụ ime ya eze.”+
-
-
1 Samuel 29:4, 5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
4 Ma, ndị isi ndị Filistia wesara ya iwe ma sị ya: “Gwa nwoke a ka ọ laghachi.+ Ya laghachi ebe i nyere ya. Ekwela ka o soro anyị jee agha, ka ọ ghara ịgbanwe obi ya lụsowezie anyị agha n’agha ahụ.+ È nwere otú ọzọ ka mma ya na onyenwe ya ga-esi kpezie ma e wezụga i bugara ya isi ndị agha anyị? 5 Ọ́ bụghị Devid a ka ndị mmadụ ji maka ya na-agba egwú, na-agụkwa egwú, sị:
‘Sọl egbuola puku kwuru puku,
Devid egbuokwala iri puku kwuru iri puku’?”+
-