1 Ndị Eze 18:45 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 45 O teghị aka, eluigwe agbachie, ifufe efewe, nnukwu mmiri ezowekwa.+ Ma, Ehab gbaara ụgbọ ịnyịnya ya lawa Jezril.+ Job 36:29 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 29 È nwere onye ga-aghọtali otú e si gbasaa urukpuruMa ọ bụ ghọta ụda égbè eluigwe nke si n’ebe o bi?*+ Job 36:31 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 31 Ọ na-eji ihe ndị a eme ka ndị mmadụ dịrị ndụ.* Ọ na-enye ha ihe oriri n’ụba.+ Job 38:25-27 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 Ònye waara idei mmiri ụzọ,Waakwara égbè eluigwe na ígwé ojii nke mmiri rujuru ụzọ,+26 Ka mmiri zoo n’ebe mmadụ na-ebighị,N’ala ịkpa mmadụ ọ bụla na-ebighị,+27 Ka mmiri ju n’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị,Meekwa ka ahịhịa pulite na ya?+ Jems 5:17, 18 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Ịlaịja bụ mmadụ ibe anyị, ma o kpesiri ekpere ike ka mmiri ghara izo. Mmiri ezoghịkwa ruo afọ atọ na ọnwa isii.+ 18 O kpekwara ekpere ọzọ, mmiri ezoo, ala emeekwa nri.+
45 O teghị aka, eluigwe agbachie, ifufe efewe, nnukwu mmiri ezowekwa.+ Ma, Ehab gbaara ụgbọ ịnyịnya ya lawa Jezril.+
29 È nwere onye ga-aghọtali otú e si gbasaa urukpuruMa ọ bụ ghọta ụda égbè eluigwe nke si n’ebe o bi?*+
25 Ònye waara idei mmiri ụzọ,Waakwara égbè eluigwe na ígwé ojii nke mmiri rujuru ụzọ,+26 Ka mmiri zoo n’ebe mmadụ na-ebighị,N’ala ịkpa mmadụ ọ bụla na-ebighị,+27 Ka mmiri ju n’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị,Meekwa ka ahịhịa pulite na ya?+
17 Ịlaịja bụ mmadụ ibe anyị, ma o kpesiri ekpere ike ka mmiri ghara izo. Mmiri ezoghịkwa ruo afọ atọ na ọnwa isii.+ 18 O kpekwara ekpere ọzọ, mmiri ezoo, ala emeekwa nri.+