17 Jehova, Onye Mgbapụta gị na Onye Nsọ Izrel, kwuru,+ sị:
“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị.
Ọ bụ m na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru,+
Na-ezikwa gị ụzọ i kwesịrị ịna-eso.+
18 Biko, na-eme ihe m nyere n’iwu.+
Ọ bụrụ na ị na-eme ya, udo ị ga-enwe ga-aha ka osimiri,+
Ị gaghịkwa akwụsị ime ezi omume otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri.+