16 N’ihi na a gaghị echeta onye ma ihe na onye nzuzu ruo mgbe ebighị ebi.+ N’oge na-adịghị anya, a ga-echefu mmadụ niile. Oleekwa otú onye ma ihe ga-esi anwụ? Ọ ga-anwụ otú onye nzuzu si anwụ.+
10 M wee hụ ka a na-eli ndị ajọ omume, ndị na-abanyebu n’ebe dị nsọ ma na-apụta. Ma, e chefuru ha ọsọ ọsọ n’obodo ebe ha nọ na-eme ajọ omume.+ Ihe a bụkwa ihe efu.
5 N’ihi na ndị dị ndụ ma na ha ga-anwụ,+ ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.+ E nweghị ụgwọ ọrụ ọzọ ha nwere, n’ihi na e chefuola ihe niile banyere ha.+