6 Jehova nọ na-agafe n’ihu ya ma na-ekwu, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko*+ ma na-eme ebere,+ onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye ịhụnanya ya*+ na eziokwu ya+ dị ukwuu,
11 Anyị na-asị na ndị tachiri obi+ na-enwe obi ụtọ.* Unu anụla otú Job si tachie obi,+ hụkwa ihe Jehova* mechara mee.+ Unu ejirikwala ya mata na ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova* n’obi, nakwa na ọ na-eme ebere.+