12 Ha ga-abịa ebe dị elu na Zayọn na-eti mkpu ọṅụ.+
Ihu ha ga na-egbukekwa egbuke n’ihi ịdị mma Jehova,
N’ihi ọka na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ,
Nakwa n’ihi ụmụ ewu na ụmụ atụrụ na ụmụ ehi ha.+
Ha ga-adịkwa ka ubi mmiri na-ede nke ọma.+
Ha agaghịkwa ahụsi anya ọzọ.”+