34 Pita wee sị: “O doola m nnọọ anya na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu.+35 Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.+
10 Ụjọ atụla unu maka ahụhụ unu na-aga ịta.+ Ekwensu ga na-eme ka a tụọ ụfọdụ n’ime unu mkpọrọ ka o wee nwaa unu ruo n’isi, kpagbuokwa unu ruo ụbọchị iri. Kwụsienụ ike n’ebe m nọ ruo mgbe unu nwụrụ, m ga-enyekwa unu okpueze bụ́ ndụ.+