Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Samuel 7:8
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 8 Gwakwa Devid ohu m, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Ị nọ na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ ka ha na-ata ahịhịa,+ mụ abịa kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú ndị m Izrel.+

  • 2 Samuel 7:16
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 16 Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọchịchị gị ga-esikwa ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.”’”+

  • 2 Samuel 23:5
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    •  5 Ezinụlọ m dị otú ahụ n’anya Chineke,

      N’ihi na mụ na ya gbara ndụ ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.+

      A haziri ihe niile gbasara ọgbụgba ndụ a ahazi. Aka agaghịkwa akpa ya.

      Ọ bụ ya ga-eme ka nzọpụta m zuo okè. Ọ bụkwa ya bụ isi ọṅụ m.

      Ọ bụ ya mere o ji eme ka ihe na-agaziri ezinụlọ m.+

  • Abụ Ọma 89:28, 29
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 28 Agaghị m akwụsị ịhụ ya n’anya ruo mgbe ebighị ebi,+

      E nweghịkwa ihe ga-emebi ọgbụgba ndụ mụ na ya.+

      29 M ga-eme ka nwa* ya nọruo mgbe ebighị ebi,

      Meekwa ka ocheeze ya dịruo mgbe ebighị ebi ka eluigwe.+

  • Jeremaya 33:25, 26
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 25 “Jehova kwukwara, sị, ‘Otú ahụ m mere ka e nwee ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na abalị,+ meekwa ka e nwee iwu* ndị na-achị eluigwe na ụwa,+ 26 otú ahụ ka m na-enweghị ike ịjụ nwa* Jekọb na nwa* Devid ohu m, agaghịkwa m ahapụ isi n’ụmụ* ya họpụta ndị ga na-achị ndị si n’ezinụlọ* Ebreham, Aịzik, na Jekọb. N’ihi na m ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha.+ M ga-emetekwara ha ebere.’”+

  • Ọrụ Ndịozi 13:34
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
    • 34 Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ gaghị abụ mmadụ ọzọ, ọ gaghịkwa anwụ anwụ ma ọ bụ ree ure. Chineke gosiri na ihe a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: ‘M gaghị akwụsị ịhụ unu n’anya* otú ahụ m kwere Devid ná nkwa. E kwesịrị ịtụkwasị m obi na m ga-emezu nkwa a.’+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya