30 Jehova ga-eme ka a nụ olu ya dị ebube.+
Ọ ga-emekwa ka a hụ mgbe ọ ga-eji ezigbo iwe jiri aka ya+ taa ndị iro ya ahụhụ.+
Ihe ndị ọ ga-eji mee ya bụ ire ọkụ nke nnukwu ọkụ+
Na oké mmiri ozuzo+ na égbè eluigwe na akụ́ mmiri ígwé.+
31 Olu Jehova ndị Asiria ga-anụ ga-eme ka ezigbo ụjọ jide ha.+
Ọ ga-apịakwa ha ụtarị.+