-
Daniel 2:40-42Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
40 “Ma alaeze nke anọ ga-esi ike ka ígwè.+ Ọ ga-akụri alaeze niile a bu ya ụzọ ma gwerie ha otú ígwè si akụri ma na-egweri ihe ọ bụla ọzọ.+
41 “Ebe ọ bụ na ị hụrụ na ihe e ji kpụọ ala ala ụkwụ ya na mkpịsị ụkwụ ya bụ ụrọ ọkpụite ji akpụ ihe nakwa ígwè, alaeze ahụ ga-ekewa ekewa. Ma ọ ga-esitụ ike ka ígwè otú ahụ ị hụrụ na a gwakọtara ígwè na ụrọ na-esighị ike. 42 Ma ebe ọ bụ na e ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ya, alaeze ahụ ga-esi ike n’ebe ụfọdụ, ma ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ.
-