37 “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe.+ Kwụsịkwanụ ịma ndị mmadụ ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe. Na-agbagharanụ* ndị mmadụ, a ga-agbagharakwa* unu.+
2N’ihi ya, onye ọ sọkwara gị bụrụ, e nweghị otú ị ga-esi ekwu na aka gị dị ọcha+ ma ọ bụrụ na ị na-ekpe mmadụ ikpe. N’ihi na mgbe ị na-ekpe onye ọzọ ikpe, ị na-ama onwe gị ikpe maka na ị na-emekwa ihe onye ị na-ekpe ikpe na-eme.+
13 N’ihi ya, ka anyị kwụsị ịna-ekpe ibe anyị ikpe,+ kama ka anyị kpebie na anyị agaghị edowe ihe mkpọbi ụkwụ n’ihu nwanna ma ọ bụ mee ihe ga-eme ka o mehie.+