-
1 Ndị Eze 17:20-23Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ọ kpọkukwara Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke m,+ gịnịkwanụ mere i ji mee nwaanyị isi mkpe a m bi n’ụlọ ya ihe a, kwe ka nwa ya nwụọ?” 21 O hulataziri n’elu nwa ahụ ugboro atọ ma kpọkuo Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke m, biko, mee ka nwatakịrị a dịghachi ndụ.” 22 Jehova nụkwara arịrịọ Ịlaịja,+ nwatakịrị ahụ adịrịghachi ndụ.+ 23 Ịlaịja akpọrọzie nwa ahụ, si n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu kpọdata ya, banye n’ọnụ ụlọ ha ma kpọnye ya nne ya, sị: “Lekwa nwa gị. Ọ dịla ndụ.”+
-
-
2 Ndị Eze 4:13-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ịlaịsha asị Gehezaị: “Biko, gwa ya, sị, ‘Ị gbaalara anyị nnukwu mbọ.+ Gịnị ka anyị ga-emere gị?+ Ò nwere ihe m ga-agwara gị eze+ ma ọ bụ onyeisi ndị agha?” Nwaanyị ahụ asị: “Mba, enweghị m nsogbu ọ bụla, n’ihi na mụ na ndị m bi.” 14 Ịlaịsha asị: “Gịnịzi ka a ga-emere ya?” Gehezaị asị: “Ọ mụtaghị nwa,*+ di ya emeekwala agadi.” 15 Ya asị ya ozugbo ahụ: “Kpọọ ya.” Ya agaa kpọọ ya, nwaanyị ahụ abịa guzoro n’ọnụ ụzọ. 16 Ịlaịsha asị: “N’ụdị oge a n’afọ ọzọ, ị ga-amụ nwa nwoke.”+ Ma ọ sịrị: “Mbanụ, nna m ukwu, ị bụ onye nke ezi Chineke, agharala nwaanyị na-ejere gị ozi ụgha.”
17 Ma, nwaanyị ahụ mechara dịrị ime, mụọkwa nwa nwoke n’ụdị oge ahụ n’afọ sochiri ya, otú Ịlaịsha gwara ya.
-