-
Luk 7:24-28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Mgbe ndị Jọn ziri ozi lawara, Jizọs malitere ịgwa ìgwè mmadụ ahụ banyere Jọn, sị: “Gịnị ka unu gara ịhụ n’ala ịkpa? Ọ̀ bụ ahịhịa amị nke ifufe na-ebugharị?+ 25 Gịnịzi ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye yi uwe mara mma?*+ N’eziokwu, ndị yi uwe mara mma ma na-ebi ndụ okomoko nọ n’ụlọ ndị eze. 26 Gịnịkwanụ ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye amụma? N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.+ 27 Onye a bụ onye ahụ e dere banyere ya, sị: ‘Lee, m na-ezipụ onye ozi m ga-ebu gị ụzọ bịa,* ọ ga-edozikwa ụzọ ị ga-esi bịa.’+ 28 Ana m asị unu, n’ime ndị niile ụmụ nwaanyị mụrụ, o nweghị onye ka Jọn ukwuu, ma onye dị ala n’Alaeze Chineke ka ya ukwuu.”+
-