14 Unu na-asịkwa, ‘Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?’ Ọ bụ n’ihi na Jehova agbaala akaebe na ị ghọrọ nwunye ị lụrụ n’okorobịa aghụghọ, n’agbanyeghị na ọ bụ nwunye gị, bụrụkwa nwaanyị gị na ya gbara ndụ.+
32 Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,* na-edowe ya n’ọnọdụ nwere ike ime ka ọ kwaa iko. Onye ọ bụla nke lụkwara nwaanyị a gbara alụkwaghịm* na-akwa iko.+
11 Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla gbara nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ, na-akwa iko,+ na-emejọkwa nwunye mbụ ya. 12 Ọ bụrụkwa na nwaanyị agbaa di ya alụkwaghịm ma lụrụ di ọzọ, ọ na-akwa iko.”+
3 N’ihi ya, mgbe di ya nọ ndụ, a ga-akpọ ya nwaanyị na-akwa iko ma ọ lụọ nwoke ọzọ.+ Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, iwu di ya ejighịzi ya. Ọ bụghị nwaanyị na-akwa iko ma ọ lụọ nwoke ọzọ.+
4 Ka mmadụ niile na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù, ka a gharakwa imerụ alụmdi na nwunye,+ n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko* ikpe, kpeekwa di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.+