32 Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,* na-edowe ya n’ọnọdụ nwere ike ime ka ọ kwaa iko. Onye ọ bụla nke lụkwara nwaanyị a gbara alụkwaghịm* na-akwa iko.+
11 Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla gbara nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ, na-akwa iko,+ na-emejọkwa nwunye mbụ ya. 12 Ọ bụrụkwa na nwaanyị agbaa di ya alụkwaghịm ma lụrụ di ọzọ, ọ na-akwa iko.”+