Abụ Ọma 2:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Ka m kọsaa ihe Jehova kwuru. Ọ gwara m, sị: “Ị bụ ọkpara m.+ Abụrụla m nna gị taa.+ Matiu 3:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Otu olu sikwa n’eluigwe+ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m,+ onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+ Luk 3:22 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 22 mmụọ nsọ wee bịa n’ụdị nduru bekwasị ya. Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+ 2 Pita 1:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 N’ihi na Chineke bụ́ Nna mere ka ọ dị ebube, meekwa ka a na-asọpụrụ ya. Chineke, onye ebube na-enweghị atụ na-esi n’aka ya, mere ihe a mgbe o kwuru gbasara ya, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+
22 mmụọ nsọ wee bịa n’ụdị nduru bekwasị ya. Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+
17 N’ihi na Chineke bụ́ Nna mere ka ọ dị ebube, meekwa ka a na-asọpụrụ ya. Chineke, onye ebube na-enweghị atụ na-esi n’aka ya, mere ihe a mgbe o kwuru gbasara ya, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+