-
Matiu 26:55, 56Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
55 Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi? M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ, na-ezi ihe,+ ma unu ejideghị m.+ 56 Ma ihe a niile mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”+ Ndị na-eso ụzọ ya niile wee hapụ ya gbaa ọsọ.+
-
-
Luk 22:52, 53Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
52 Jizọs wee gwa ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ na ndị okenye chọ ya bịa ebe ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi?+ 53 Mgbe mụ na unu na-anọ n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị,+ unu ejideghị m.+ Ma, oge a bụ oge unu nakwa oge e nyere ndị nọ n’ọchịchịrị ikike.”+
-