16 Jọn gwara ha niile, sị: “Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim. Ma onye ka m ike na-abịa, onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+
26 Jọn zara ha, sị: “Eji m mmiri na-eme baptizim. E nwere onye unu na ya nọ unu na-amaghị, 27 onye na-abịa n’azụ m. Erughị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.”+
25 Ma mgbe ọrụ Jọn na-agwụcha, ọ na-adị asị: ‘Ònye ka unu chere na m bụ? Abụghị m onye unu chere na m bụ. Kama, e nwere onye na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+