21 Ma mgbe Jọn nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, o mekwara Jizọs baptizim.+ Ka Jizọs nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere,+ 22 mmụọ nsọ wee bịa n’ụdị nduru bekwasị ya. Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+