27 Jizọs sịkwara: “Nna m enyefeela m ihe niile.+ O nweghị onye ma m* nke ọma ma e wezụga Nna m.+ O nweghịkwa onye ma Nna m nke ọma ma e wezụga mụnwa na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.+
22 Nna m enyefeela m ihe niile, o nweghịkwa onye ma m* ma e wezụga Nna m.+ O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.”+