15 N’ihi na unu enwetaghị mmụọ nke na-eme ka unu gbawa ohu ma tụwa egwu, kama unu nwetara mmụọ nke mere ka unu bụrụ ụmụ. Mmụọ ahụ na-emekwa ka anyị na-eti mkpu, sị: “Aba,* Nna!”+
2 N’ihi na unu ma na n’agbanyeghị na anyị bu ụzọ taa ahụhụ na Filipaị,+ a kparịakwa anyị, Chineke nyeere anyị aka, anyị akata obi* zie unu ozi ọma Chineke+ n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu anyị nke ukwuu.