-
1 Ndị Kọrịnt 5:11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
11 Ma, akwụkwọ m na-edetara unu ugbu a bụ ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna, bụ́ onye na-akwa iko,* ma ọ bụ onye anyaukwu,+ ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị, ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ,* ma ọ bụ onye aṅụrụma,+ ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe,+ kwụsị ịna-emekọrịta ihe.*+ Unu na onye dị otú a erikọkwala ihe.
-
-
Ndị Efesọs 4:17-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 N’ihi ya, ihe m ji aha Onyenwe anyị na-agwa unu ma na-agba unu ume bụ ka unu kwụsị ịna-eje ije otú ndị mba ọzọ na-eje,+ n’ihi na ha na-ebi ndụ otú echiche ha na-abaghị uru na-agwa ha.+ 18 Uche ha gbara ọchịchịrị, ha enweghịkwa olileanya ịdị ndụ Chineke ga-eme ka anyị dịrị, n’ihi na ha amaghị ihe, ihe anaghịkwa emetụ ha n’obi.* 19 Ebe ọ bụ na mmehie ha anaghịzi ewute ha, ha wepụtara onwe ha na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ jirikwa anyaukwu na-eme ụdị omume niile na-adịghị ọcha.
-