Matiu 1:21 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 21 Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Jizọs,*+ n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.”+ Jọn 3:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya n’ụwa ka o kpee ụwa ikpe, kama ka e si n’aka ya zọpụta ụwa.+ Jọn 12:47 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 47 Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu m, ma ọ naghị eme ya eme, anaghị m ekpe ya ikpe, n’ihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.+ Ọrụ Ndịozi 5:31 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 31 Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya.+ Ọ họpụtara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Ndú+ na Onye Nzọpụta.+ Chineke mere ihe a ka ndị Izrel chegharịa, ka a gbagharakwa ha mmehie ha.+
47 Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu m, ma ọ naghị eme ya eme, anaghị m ekpe ya ikpe, n’ihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.+
31 Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya.+ Ọ họpụtara ya ka ọ bụrụ Nnukwu Onye Ndú+ na Onye Nzọpụta.+ Chineke mere ihe a ka ndị Izrel chegharịa, ka a gbagharakwa ha mmehie ha.+