-
2 Ndị Kọrịnt 5:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Ma ihe niile si n’aka Chineke, onye si n’aka Kraịst mee ka anyị na ya dị ná mma,+ ziekwa anyị ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ya na ha dị ná mma.+ 19 Nke a pụtara na Chineke si n’aka Kraịst na-eme ka ya na ndị mmadụ dị ná mma,+ ọ naghịkwa agụkọrọ ha mmehie ha.+ O ziekwala anyị ka anyị na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ya na ha dị ná mma.+
-
-
1 Jọn 2:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ụmụntakịrị m, m na-edere unu ihe ndị a ka unu ghara ime mmehie. Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka, onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst,+ onye ezi omume.+ 2 Ọ bụ àjà a chụrụ maka mmehie anyị+ ka anyị na Chineke wee dị n’udo,+ ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị, kama ọ bụkwa maka mmehie ụwa niile.+
-