28 Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, mgbe a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ n’ocheeze ya dị ebube, ununwa ndị na-eso m ga-anọdụkwa n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+
28 “N’eziokwu, unu ahapụghị m+ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.+29 Mụ na unu na-agbakwa ndụ na unu ga-achị n’alaeze, dịkwa ka mụ na Nna m gbara ndụ,+30 ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’Alaeze m,+ nọdụkwa ala n’ocheeze+ na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+