Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 31
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Ndị Izrel megwaara ndị Midian (1-12)

        • E gburu Belam (8)

      • E nyere ntụziaka maka ihe ndị a kwatara n’agha (13-54)

Ọnụ Ọgụgụ 31:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 94:1; Aịz 1:24; Ne 1:2
  • +Ọg 22:7; 25:1-3, 17, 18; 1Kọ 10:8; Mkp 2:14
  • +Ọg 27:12, 13; Di 32:48-50

Ọnụ Ọgụgụ 31:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 26:51

Ọnụ Ọgụgụ 31:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 25:7, 8
  • +Ọg 10:2, 9

Ọnụ Ọgụgụ 31:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:12; 2Pi 2:15; Mkp 2:14

Ọnụ Ọgụgụ 31:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ụlọikwuu ha a gbara ogige.”

Ọnụ Ọgụgụ 31:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:1

Ọnụ Ọgụgụ 31:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 25:1, 2; Mkp 2:14
  • +Ọg 25:17, 18; Di 4:3; Jos 22:17
  • +Ọg 25:9; 1Kọ 10:8

Ọnụ Ọgụgụ 31:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 31:35

Ọnụ Ọgụgụ 31:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 5:2; 19:11, 16
  • +Ọg 19:20

Ọnụ Ọgụgụ 31:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “sachapụ uwe ọ bụla mmehie.”

Ọnụ Ọgụgụ 31:22

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “opu.”

Ọnụ Ọgụgụ 31:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:9

Ọnụ Ọgụgụ 31:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 19:19, 20

Ọnụ Ọgụgụ 31:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 22:7, 8; 1Sa 30:24

Ọnụ Ọgụgụ 31:28

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ọnụ Ọgụgụ 31:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:20, 29

Ọnụ Ọgụgụ 31:30

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:19
  • +Ọg 3:6, 7; 18:2, 3; 1Ih 23:32

Ọnụ Ọgụgụ 31:35

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 31:18

Ọnụ Ọgụgụ 31:40

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”

  • *

    Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”

Ọnụ Ọgụgụ 31:41

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 18:8, 19

Ọnụ Ọgụgụ 31:46

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”

Ọnụ Ọgụgụ 31:47

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:19
  • +Ọg 3:6, 7; 18:2, 3; 1Ih 23:32

Ọnụ Ọgụgụ 31:48

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 31:4

Ọnụ Ọgụgụ 31:49

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 23:27; Le 26:7, 8

Ọnụ Ọgụgụ 31:50

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”

Ọnụ Ọgụgụ 31:52

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.

Ọnụ Ọgụgụ 31:54

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ, “ka Jehova wee na-echeta ndị Izrel.”

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 31:2Ọm 94:1; Aịz 1:24; Ne 1:2
Ọnụ Ọgụ. 31:2Ọg 22:7; 25:1-3, 17, 18; 1Kọ 10:8; Mkp 2:14
Ọnụ Ọgụ. 31:2Ọg 27:12, 13; Di 32:48-50
Ọnụ Ọgụ. 31:5Ọg 26:51
Ọnụ Ọgụ. 31:6Ọg 25:7, 8
Ọnụ Ọgụ. 31:6Ọg 10:2, 9
Ọnụ Ọgụ. 31:8Ọg 22:12; 2Pi 2:15; Mkp 2:14
Ọnụ Ọgụ. 31:12Ọg 22:1
Ọnụ Ọgụ. 31:16Ọg 25:1, 2; Mkp 2:14
Ọnụ Ọgụ. 31:16Ọg 25:17, 18; Di 4:3; Jos 22:17
Ọnụ Ọgụ. 31:16Ọg 25:9; 1Kọ 10:8
Ọnụ Ọgụ. 31:18Ọg 31:35
Ọnụ Ọgụ. 31:19Ọg 5:2; 19:11, 16
Ọnụ Ọgụ. 31:19Ọg 19:20
Ọnụ Ọgụ. 31:23Ọg 19:9
Ọnụ Ọgụ. 31:24Ọg 19:19, 20
Ọnụ Ọgụ. 31:27Jos 22:7, 8; 1Sa 30:24
Ọnụ Ọgụ. 31:29Ọg 18:20, 29
Ọnụ Ọgụ. 31:30Di 12:19
Ọnụ Ọgụ. 31:30Ọg 3:6, 7; 18:2, 3; 1Ih 23:32
Ọnụ Ọgụ. 31:35Ọg 31:18
Ọnụ Ọgụ. 31:41Ọg 18:8, 19
Ọnụ Ọgụ. 31:47Di 12:19
Ọnụ Ọgụ. 31:47Ọg 3:6, 7; 18:2, 3; 1Ih 23:32
Ọnụ Ọgụ. 31:48Ọg 31:4
Ọnụ Ọgụ. 31:49Ọp 23:27; Le 26:7, 8
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
  • 37
  • 38
  • 39
  • 40
  • 41
  • 42
  • 43
  • 44
  • 45
  • 46
  • 47
  • 48
  • 49
  • 50
  • 51
  • 52
  • 53
  • 54
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 31:1-54

Ọnụ Ọgụgụ

31 Jehova gwaziri Mosis, sị: 2 “Megwara+ ndị Midian ihe ha mere ndị Izrel.+ E mechaa, ị ga-anwụ, e liekwa gị otú e liri ndị nna nna gị.”+

3 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Kwadebenụ ụfọdụ ụmụ nwoke n’ime unu ka ha gaa lụso ndị Midian agha, ka ha bọọrọ Jehova ọbọ n’isi ndị Midian. 4 Unu ga-esi n’ebo ọ bụla e nwere n’Izrel họpụta otu puku otu puku mmadụ ka ha soro gaa agha.” 5 E wee si n’ime puku kwuru puku ndị Izrel+ họpụta otu puku otu puku mmadụ n’ebo nke ọ bụla, ya bụ, puku mmadụ iri na abụọ (12,000) a kwadebere maka ịga agha.

6 Mosis wee dunye otu puku otu puku mmadụ ahụ si n’ebo nke ọ bụla agha, ha na Finihas+ nwa Elieza onye nchụàjà. Finihas bu arịa ndị dị nsọ na opi agha.+ 7 Ha lụsoro ndị Midian agha otú Jehova nyere Mosis n’iwu. Ha gburu ụmụ nwoke niile. 8 Ndị ọzọ ha gbukwara bụ ndị eze Midian, ya bụ, Ivaị, Rikem, Zọọ, Họọ, na Riba, bụ́ ndị eze ise na-achị Midian. Ha jikwa mma agha gbuo Belam+ nwa Biọ. 9 Ma ndị Izrel dọọrọ ụmụ nwaanyị na ụmụaka ndị Midian n’agha. Ha chịkọkwaara anụ ụlọ ha niile na anụmanụ ha ndị ọzọ, bukọrọkwa akụ̀ ha niile. 10 Ha gbara obodo niile ha bi ọkụ, gbaakwa ebe niile ha mara ụlọikwuu* ọkụ. 11 Ha bukọọrọ ihe niile ha kwatara, ma ndị mmadụ ha dọtara n’agha ma anụmanụ ha kpụtara. 12 Ha wee kpọrọ ndị ahụ ha dọtara n’agha, chịrịkwa anụ ndị ha kpụtara na ihe ndị ha kwatara bịakwute Mosis na Elieza onye nchụàjà nakwa nzukọ Izrel n’ebe ha mara ụlọikwuu n’ọzara Moab,+ n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.

13 Mosis na Elieza onye nchụàjà na ndị niile bụ́ ndị isi nzukọ Izrel sizi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gawa izute ha. 14 Ma Mosis wesara ndị e mere ndị isi ndị agha ahụ iwe, ya bụ, ndị isi otu puku otu puku ndị agha nakwa ndị isi otu narị otu narị ndị agha, bụ́ ndị si agha ahụ na-alọta. 15 Mosis sịrị ha: “Ùnu hapụrụ ụmụ nwaanyị niile ndụ? 16 Ọ bụ ha ka Belam gwara okwu, ha arafuo ndị Izrel, ndị Izrel ahapụ Jehova+ gaa fewe chi ụgha nke Piọ,+ nke mere ọrịa ọjọọ ji rịawa nzukọ Jehova.+ 17 Ugbu a, gbuonụ nwoke ọ bụla n’ime ụmụaka ndị ahụ, gbuokwanụ nwaanyị ọ bụla ya na nwoke nwetụrụla mmekọahụ. 18 Ma, unu nwere ike ịhapụ ụmụ agbọghọ niile ha na nwoke na-enwetụbeghị mmekọahụ.+ 19 Unu ga-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche n’ebe anyị mara ụlọikwuu ma nọrọ n’ebe ahụ ruo ụbọchị asaa. Onye ọ bụla n’ime unu nke gburu mmadụ* na onye ọ bụla metụrụ onye e gburu egbu aka+ ga-eme onwe ya ka ọ dị ọcha+ n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị nke asaa, ma ununwa ma ndị unu dọtara n’agha. 20 Unu ga-emekwa ka uwe ọ bụla dị ọcha* nakwa ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ihe ọ bụla e ji ajị ewu rụọ, na ihe ọ bụla e ji osisi rụọ.”

21 Elieza onye nchụàjà wee gwa ụmụ nwoke ahụ gara agha, sị: “Ihe a bụ iwu Jehova nyere Mosis: 22 ‘Ọ bụ naanị ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, ígwè, gbamgbam, na nkume led,* 23 ihe ọ bụla ọkụ na-agaghị emebili, ka unu ga-eji ọkụ mee ka ọ dị ọcha. Ma, a ga-ejikwa mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha mee ka ọ dị ọcha.+ Ihe ọ bụla ga-emebi ma e tinye ya n’ọkụ, jirinụ mmiri ahụ sachaa ya. 24 Unu ga-asakwa uwe unu n’ụbọchị nke asaa wee dị ọcha, unu abatazie n’ebe anyị mara ụlọikwuu.’”+

25 Jehova gwaziri Mosis, sị: 26 “Gị na Elieza onye nchụàjà na ndị isi ọnụmara nzukọ a dee ihe ndị a kwatara n’agha n’akwụkwọ. Unu ga-agụ ndị unu dọtara n’agha ọnụ, gụọkwa anụmanụ ndị unu kpụtara ọnụ. 27 Keenụ ihe ndị ahụ a kwatara n’agha ụzọ abụọ. Werenụ otu ụzọ nye ndị so gaa agha, werekwanụ nke ọzọ nye ndị niile fọrọ ná nzukọ a.+ 28 Ka ndị agha ahụ gara agha kpọnye gị otu onye* n’ime narị mmadụ ise (500) ọ bụla, kpụnyekwa gị otu ehi n’ime narị ehi ise (500) ọ bụla, otu jakị n’ime narị jakị ise (500) ọ bụla, otu ewu ma ọ bụ atụrụ n’ime narị ewu na atụrụ ise (500) ọ bụla, ka ha bụrụ ụtụ a ga-atụrụ Jehova. 29 Unu ga-esi n’ihe ha ketara were ya nye Elieza onye nchụàjà ka ọ bụrụ onyinye e nyere Jehova.+ 30 Ị ga-esikwa n’ihe e kenyere ndị Izrel kpọrọ otu onye n’ime mmadụ iri ise ọ bụla, kpụrụkwa otu ehi n’ime ehi iri ise, otu jakị n’ime jakị iri ise, otu ewu ma ọ bụ atụrụ n’ime ewu na atụrụ iri ise, nakwa ụdị anụ ụlọ ọ bụla. Ị ga-ewere ha nye ndị Livaị,+ bụ́ ndị na-arụ ọrụ gbasara ụlọikwuu Jehova.”+

31 Mosis na Elieza onye nchụàjà mere nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 32 Ihe ndị fọrọ n’anụmanụ ndị ahụ gara agha kpụ lọta nakwa ndị fọrọ ná ndị ha dọtara n’agha dị narị puku ewu na atụrụ isii na puku iri asaa na ise (675,000), 33 puku ehi iri asaa na puku abụọ (72,000), 34 puku jakị iri isii na otu puku (61,000), 35 na puku ụmụ nwaanyị iri atọ na puku abụọ (32,000) ndị ha na nwoke na-enwetụbeghị mmekọahụ.+ 36 Otu ọkara e kenyere ndị ahụ gara agha dị narị puku ewu na atụrụ atọ, puku iri atọ na asaa na narị ise (337,500). 37 Ewu na atụrụ a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị narị isii na iri asaa na ise (675). 38 Ehi niile dị puku iri atọ na puku isii (36,000). Ehi a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị iri asaa na abụọ. 39 Jakị niile dị puku iri atọ na narị ise (30,500). Jakị a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị iri isii na otu. 40 Mmadụ* niile dị puku iri na isii (16,000). Mmadụ* a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị iri atọ na abụọ. 41 Mosis wee nye Elieza onye nchụàjà ụtụ ahụ ka ọ bụrụ onyinye e nyere Jehova,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

42 Ihe ndị a bụ ọkara nke ọzọ e kenyere ndị Izrel, ya bụ, ihe ndị Mosis si n’ihe ndị ahụ gara agha kwatara kepụta: 43 ọkara ewu na atụrụ ahụ dị narị puku atọ, puku iri atọ na asaa na narị ise (337,500), 44 ehi dị puku iri atọ na puku isii (36,000), 45 jakị dị puku iri atọ na narị ise (30,500), 46 mmadụ* adịrị puku iri na isii (16,000). 47 Mosis wee si n’ọkara ahụ ndị Izrel ketara kpọrọ otu onye n’ime mmadụ iri ise ọ bụla, kpụrụkwa otu anụmanụ n’ime anụmanụ iri ise ọ bụla ma nye ha ndị Livaị,+ bụ́ ndị na-arụ ọrụ gbasara ụlọikwuu Jehova,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.

48 Ndị e mere ndị isi puku kwuru puku ndị agha ahụ,+ ya bụ, ndị isi otu puku otu puku ndị agha nakwa ndị isi otu narị otu narị ndị agha, bịakwutere Mosis. 49 Ha wee sị Mosis: “Anyị bụ́ ndị ohu gị agụọla ndị agha anyị na-achị ọnụ. E nweghị otu onye n’ime ha a na-achọ achọ.+ 50 N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị nye ihe o nwetara ka ọ bụrụ onyinye a ga-enye Jehova, ya bụ, ihe ndị e ji ọlaedo mee, ọla ụkwụ, ọla aka, mgbaaka ndị e ji aka ihe akara, ọla ntị, ihe ndị ọzọ e ji achọ mma, ka e jiri ha kpuchiere anyị* mmehie n’ihu Jehova.”

51 Mosis na Elieza onye nchụàjà wee nara ha ọlaedo ndị ahụ, ihe niile ahụ e ji achọ mma. 52 Ọlaedo niile ha nyere Jehova n’onyinye, bụ́ ndị ha natara ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị isi otu narị otu narị ndị agha, dị puku shekel* iri na isii, narị asaa na iri ise (16,750). 53 Onye ọ bụla n’ime ndị agha ahụ ketara ihe n’ihe ha kwatara. 54 Mosis na Elieza onye nchụàjà naara ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị isi otu narị otu narị ndị agha ọlaedo ndị ahụ ma webata ha n’ụlọikwuu nzute ka ndị Izrel wee na-echeta ihe Jehova meere ha.*

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya