Job
21 Job wee sị:
2 “Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu,
Ka ọ bụrụ otú unu ga-esi kasie m obi.
3 Nweerenụ m ndidi ka m kwuo okwu.
M kwuchaa, unu nweziri ike ịkwa m emo.+
4 Ọ̀ bụ mmadụ ka m na-ekpesara?
Ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ, ọ̀ bụ na ike inwe ndidi agaghị agwụ m?
5 Lewenụ m anya, ka akpata oyi wụọkwa unu n’ahụ́.
Kpuchienụ aka n’ọnụ.
6 M chewe banyere ya, obi anaghị ezu m ike,
Ahụ́ m niile na-amakwa jijiji.
8 Ha na-ahụ ka ụmụ ha na-eto ghọọ mmadụ,
Ha na-ahụkwa ụmụ ụmụ ha.
10 Oké ehi ha na-agba nne ehi n’enweghị nsogbu ọ bụla.
Nne ehi ha na-amụ ụmụ, ime anaghịkwa apụ ha.
11 Ụmụaka ha ndị nwoke na-agbagharị n’èzí otú ewu na atụrụ si agbagharị,
Ụmụ ha na-awụgharịkwa.
14 Ma ha na-asị ezi Chineke, ‘Hapụ anyị aka!
Anyị achọghị ịma ihe i nyere n’iwu.*+
15 Ònye bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke mere anyị ga-eji fee ya?*+
Olee uru anyị ga-erite ma anyị na ya dịrị ná mma?’+
16 Ma ama m na ọ bụghị ha na-eme ka ihe na-agaziri ha.+
Anaghị m eche echiche otú ndị ajọ omume si eche.+
17 Ugboro ole ka e menyụrụla ọkụ* ndị ajọ omume?+
Ugboro ole ka ọdachi na-abịara ha?
Ugboro ole ka Chineke jitụrụla iwe bibie ha?
19 Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe ọjọọ, Chineke ga-ata ụmụ ya ahụhụ ihe o mere.
Ma ka Chineke kwụọ ya ụgwọ ihe o mere ka ọ hụ ya.+
20 Ka o jiri anya ya hụ otú a ga-esi laa ya n’iyi,
Ka ọ bụrụkwa ya ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-ewesa iwe ya.*+
23 Otu onye na-anwụ mgbe ike ndụ ka juru ya ahụ́,+
Mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụla na-echegbu ya nakwa mgbe obi ruru ya ala,+
24 Mgbe apata ụkwụ ya bụ abụba abụba,
Mgbe ọkpụkpụ ya ka gbasikwara ike.*
25 Ma onye ọzọ na-atagide ahụhụ nwụọ,
N’enweghị mgbe o kporiri ndụ.
28 N’ihi na unu na-asị, ‘Oleezi ụlọ onye ahụ a ma ama?
Oleekwa ụlọikwuu onye ajọ omume bibu?’+
29 Ọ̀ bụ na unu ajụbeghị ndị na-aga ebe dị iche iche ase?
Ọ̀ bụ na unu anaghị echebara ihe ndị ha chọpụtara echiche nke ọma,
30 Na a na-ahapụ onye ọjọọ ndụ n’ụbọchị ọdachi,
Napụtakwa ya n’ụbọchị oké iwe?
31 Ònye ga-ajụ ya ajụjụ maka ihe ọ na-eme?
Ònyekwa ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere?
32 Mgbe a na-ebuga ya n’ebe a ga-eli ya,
A ga-eche ili ya nche.
Ka imirikitiimi ndị bu ya ụzọ.
34 Gịnịzi mere unu ji jiri okwu na-enweghị isi na-akasi m obi?+
Ihe niile unu na-aza m bụ ụgha.”