Abụ Ọma
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid ohu Jehova.
36 Ọ bụ ihe ọjọọ na-achị obi onye ajọ omume.
Ọ naghị atụ egwu Chineke.+
3 Ihe ọ na-ekwu n’ọnụ ya na-agbawa obi, na-eduhiekwa mmadụ.
Ọ maghịzi otú e si eme ihe ọma.
4 Ọ na-anọdị n’elu àkwà* ya akpa nkata ọjọọ.
Ọ na-eso ụzọ na-adịghị mma.
Ọ naghị ajụ ihe ọjọọ.
5 Jehova, ịhụnanya gị* na-eru n’eluigwe.+
Ihe ọma ị na-eme na-eru n’ígwé ojii.
6 Ezi omume gị dị ka nnukwu ugwu.*+
Ihe ndị ị na-ekpebi karịrị akarị. Ha dị omimi ka ogbu mmiri.+
Jehova, ị na-echebe* mmadụ na anụmanụ.+
7 Chineke, ịhụnanya gị* enweghị atụ.+
Ọ bụ n’okpuru nku gị ka ndị mmadụ na-agbaba ka e chebe ha.+
8 Ha na-eri ihe ọma* ndị juru n’ụlọ gị, rijuo afọ.+
Ị na-emekwa ka ha rie ihe ọma ndị na-asọ ka mmiri.+
Ọ bụ ìhè gị na-enye anyị ìhè.+
11 Ekwela ka ndị dị mpako zọọ m ụkwụ,
Ekwekwala ka ndị ajọ omume kwapụ m.
12 Lee, ndị na-eme ihe ọjọọ adaala.
A kụtuola ha, ha enweghịkwa ike ibili.+