Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 10/8 p. 3-5
  • Olee Mba nke Na-enweghị Mpụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Mba nke Na-enweghị Mpụ?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Mgbalị Iji Kwụsị Mpụ
    Teta!—1996
  • Ọgụ Na-enweghị Isi A Na-alụso Mpụ
    Teta!—1998
  • Mgbe Mpụ Na-adịghị
    Teta!—1998
  • N’ikpeazụ—Ọchịchị nke Ga-akwụsị Mpụ
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 10/8 p. 3-5

Olee Mba nke Na-enweghị Mpụ?

Olili ozu ya bụ otu n’ime ndị kasị ukwuu e nweworo na Moscow n’ọtụtụ afọ. Ọtụtụ puku mmadụ kwụrụ n’ahịrị n’okporo ámá iji kwanyere onye Russia ahụ na-eto eto, bụ́ onye mgbọ égbè ndị ogbu ọchụ napụrụ ndụ ya n’ike na March 1, 1995, ùgwù ikpeazụ ha. N’ịbụ onye a gbagburu na nso ọnụ ụzọ ya, Vladislav Listyev, bụ́ onye a kpọrọ dị ka onye nta akụkọ nke afọ 1994, abụrụwo onye a ma ama nke ukwuu na telivishọn.

IHE na-erughị izu atọ mgbe nke ahụ gasịrị, na March 20, ụzọ okpuru ala Tokyo nọ n’oge ụba mmadụ isi ụtụtụ, bụ́ nke ọ na-enwe mgbe nile, mgbe e ji gas na-egbu mmadụ wakwasị ya. Ọtụtụ mmadụ nwụrụ; e merụrụ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ nke ukwuu.

Mgbe ahụ, n’April 19, Oklahoma City ghọrọ ebe ndị na-ekiri telivishọn n’ụwa nile lekwasịrị anya. Ha ji oké ụjọ na-ekiri ka ndị ọrụ nnapụta na-adọpụta ozu ndị tipịasịrị etipịa n’ikpo otu ụlọ ndị gọọmenti nke ndị na-eyi ọha egwu ka ji nnọọ bọmbụ kụrie. Ndị nwụrụ dị 168.

Ná ngwụsị June nke afọ a, mwakwasị ọzọ yiri ya, na nso Dhahran, Saudi Arabia gburu ndị America 19 ma merụọ ihe dị ka mmadụ 400 ahụ.

Ihe omume anọ ndị a na-egosi na mpụ na-eweghara ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị ọhụrụ. Omume obi ọjọọ nke iyi ọha egwu nọgidere na-atụkwasị ihe na mpụ ndị “dị adị.” Ihe omume anọ ahụ dum—nke ọ bụla n’ụzọ nke ya—na-egosi otú mwakpo mpụ pụrụ isi metụta onye ọ bụla. Ma ị̀ nọ n’ụlọ, n’ebe ọrụ, ma ọ bụ n’okporo ámá, mpụ pụrụ iti gị aka ọjọọ. N’ezie, otu nnyocha e mere na Britain gosiri na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke ndị Britain chere na o yikarịrị ka mpụ pụrụ imetụta ha ugbu a karịa ka ọ pụrụ imeworị n’afọ iri gara aga. Ọnọdụ dị n’ebe i bi pụrụ iyi nke ahụ.

Ụmụ amaala na-erubere iwu isi na-atụ anya maka gọọmenti nke ga-eme ihe karịrị nanị ịchịkwa mpụ. Ha chọrọ gọọmenti nke ga-akwụsị ya kpam kpam. Ọ bụkwa ezie na iji otu ọ̀tụ̀tụ̀ mpụ tụnyere ibe ya pụrụ ịtụ aro na gọọmenti ụfọdụ dị irè n’igbochi mpụ karịa ndị ọzọ, ọnọdụ ahụ dum na-egosi na gọọmenti ihe a kpọrọ mmadụ na-ada n’ọgụ ọ na-alụso mpụ. Ma, ọ bụghị ihe na-ekweghị omume ma ọ bụ echiche Ebe Ihe Nile Zuru Okè ikwere na gọọmenti ga-akwụsị mpụ n’isi nso. Ma olee gọọmenti ọ bụ? Olee mgbekwa?

[Igbe/Map dị na peeji 4, 5]

ỤWA NKE JUPỤTARA NA MPỤ

EUROPE: Akwụkwọ ndị Itali (“Ohere ahụ na Onye Ohi Ahụ”) sịrị na n’ime mkpirikpi oge, ọnụ ọgụgụ mpụ e mere megide ihe onwunwe n’Itali ‘eruwo ọnụ ọgụgụ kasị elu ndị e lere anya [n’otu oge] dị ka nke na-agaghị ekwe omume.’ Ukraine, bụ́ repọblik nke ebe bụbu Soviet Union, nyere akụkọ mpụ 490 maka ụba mmadụ 100,000 ọ bụla na 1985 na 922 ka ọ na-erule 1992. Ọnụ ọgụgụ ahụ ka na-arị elu. O jughị anya na akwụkwọ akụkọ Russia (“Arụmụka na Eziokwu”) dere, sị: “Anyị na-arọ nrọ ịdị ndụ—nke ịdịgide ndụ—nke ịlanarị oge a dị egwu . . . egwu nke ịbanye n’ụgbọ okporo ígwè—a pụrụ ime ka ọ gbapụ n’okporo ígwè ma ọ bụ bibie ya; egwu nke ife efe—a na-ejidekarị ụgbọelu ma ọ bụ ụgbọelu pụkwara ịda n’ike; egwu nke ịbanye n’ụgbọ ndị na-agba n’okpuru ala—n’ihi nsọkọta isi ma ọ bụ mgbawa n’ike; egwu nke ịga ije n’okporo ámá—mgbọ égbè ndị ọzọ na-agbarịta onwe ha pụrụ ịtụ gị ma ọ bụ a pụrụ izu gị ohi, dinaa gị n’ike, tie gị ihe, ma ọ bụ gbuo gị; egwu nke ịbanye n’ụgbọala—a pụrụ ịgba ya ọkụ, gbarie ya, ma ọ bụ zuru ya; egwu nke ịbanye na paseji ụlọ obibi, ụlọ iri ihe, ma ọ bụ ụlọ ahịa—a pụrụ imerụ gị ahụ ma ọ bụ gbuo gị n’ime nke ọ bụla n’ime ha.” Magazin ndị Hungary bụ́ HVG ji otu obodo ukwu anwụ na-acha na Hungary tụnyere “isi ụlọ ọrụ òtù Mafia,” na-ekwu na n’ime afọ atọ gara aga, ọ bụrụwo “ebe mmalite maka ụdị mpụ ọhụrụ ọ bụla . . . Ihe ndị egwu na-akpatagasị na-arị elu ka ndị mmadụ na-ahụ na ndị uwe ojii adịghị njikere ịlụso òtù ndị Mafia ọgụ.”

AFRICA: Akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily Times nke Nigeria kọrọ na “ụlọ akwụkwọ dị iche iche nke mmụta dị elu” n’otu mba dị n’Ọdịda Anyanwụ Africa na-enwe “ntiwapụ nke imenye ụjọ, nke ndị òtù nzuzo dị iche iche na-akpata: ruo n’ọnọdụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ịkwụsị agụmakwụkwọ ọ bụla bara uru.” Ọ gara n’ihu, sị: “Ntiwapụ ahụ na-agbasa n’ụzọ na-arị elu, nke mfu ndụ na ihe onwunwe na-esochi.” Banyekwara mba ọzọ n’Africa, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Star nke South Africa kọrọ, sị: “E nwere ụdị abụọ nke ime ihe ike: agha ógbè na ógbè, na ime ihe ike mpụ nkịtị. Nke mbụ ebelatawo n’ụzọ pụtara ìhè, nke abụọ arịwo elu.”

OCEANIA: Ụlọ Akwụkwọ Mmụta Banyere Mpụ nke Australia na-eme atụmatụ na mpụ na-efu “ma ọ dịkarịa ala ijeri $27 kwa afọ, ma ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ $1600 maka nwoke, nwanyị na nwatakịrị ọ bụla” n’ebe ahụ. Nke a bụ “ihe dị ka 7.2 pasent nke ihe nile a na-emepụta ná mba ahụ.”

KỌNTINENT NDỊ DỊ N’AMERICA: Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Canada kọrọ ịrị elu na mpụ ime ihe ike na Canada n’ime oge na-adịbeghị anya bụ́ afọ 12 sochiri ibe ha, ha nile bụ “akụkụ nke ọnọdụ kpataworo ịrị elu dị 50 pasent n’ime ihe ike n’ime afọ iri gara aga. Ka ọ dị mgbe ahụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ El Tiempo nke Colombia kọrọ na ntọrọ dị 1,714 weere ọnọdụ n’afọ na-adịbeghị anya na Colombia, bụ́ “ọnụ ọgụgụ karịrị okpukpu abụọ nke ntọrọ nile e dekọrọ n’akụkụ ụwa ọzọ dum n’ime otu oge ahụ. Dị ka Ngalaba Ezi Ikpe nke Mexico sikwa kọọ, e mere otu mpụ mmekọahụ n’isi obodo ya kwa hour anọ n’ime otu afọ na-adịbeghị anya. Otu nwanyị bụ ọnụ na-ekwuru ya rụtụrụ aka na e jiriwo iweda ùgwù ndị mmadụ n’ala mara narị afọ nke 20. “Anyị na-ebi n’ọgbọ nke na-atụfu ihe o jiworo mee ihe,” ka o kwubiri.

ỤWA NILE: Akwụkwọ bụ́ The United Nations and Crime Prevention na-arịba ama “ịrị elu na-aga n’ihu n’ime mpụ n’ụwa nile n’afọ ndị 1970 na ndị 1980.” Ọ na-asị: “Ọnụ ọgụgụ mpụ e dekọrọ rịrị elu malite n’ihe dị ka nde 330 na 1975 ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde 400 na 1980, a na-emekwa atụmatụ na o ruwo ọkara ijeri na 1990.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Map na ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1995 Digital Wisdom, Inc.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Ụwa na peji nke 3, 6, na 9: NASA photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya