Ihe Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Igwe Africa
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Kenya
ALA na-enweghị oké ọhịa nke Africa bụ nke kpọrọ nkụ, na-achakwa nchara nchara, bụrụ nke anyanwụ na-achasi ike nke ebe akara equator mere ka o sie ike. Anyị jisiri ike gafee ogwu na uke ndị ahụ.
Na mberede anyị kwụsịrị. Ụcha nke ụdị àgwà dị iche iche adọrọwo mmasị anyị. Otu ntakịrị nnụnụ nke nwere àgwà na-egbukepụ egbukepụ nke ukwuu nke na ọ dị ka a ga-asị na e tinyere anyanwụ n’onwe ya n’ime ụmụ obere ábụ́bà ya, bekwasịrị n’otu alaka osisi na-ama okooko osisi. N’ụzọ kwesịrị ekwesị a kpọrọ ihe a dị oké ọnụ ahịa nke nwere nku nzá.
Enyo Ọla
E nwere ihe karịrị otu narị ụdị nzá. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha dị n’akụkụ Africa na-ekpo ọkụ, ma a pụkwara ịhụ ha n’Esia, Australia, na ọbụna n’àgwàetiti Pacific. N’ịmaru mma dị ka ha dịruru iche iche, nzá na-egbukepụ ìhè anyanwụ dị ka enyo ọla, na-egosipụta ọtụtụ àgwà na-enwupụ enwupụ: ụcha na-egbuke egbuke nke ọbara ọbara, odo odo, anụnụ anụnụ, na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ tinyere ụdị ụcha dịgasị iche iche nke ọla copper.
A na-ejikarị nzá atụnyere nnụnụ hummingbird nke America. Dị ka nnụnụ hummingbird, ha tụrụ àgwà mara oké mma ma na-amị mmiri okooko osisi. Otú ọ dị, ha bukarịrị nnụnụ hummingbird n’ibu, ha enweghịkwa nkà ife ufe nke ndị ogbo ha si Ebe Ugwu America nwere.
N’ozuzu ha, nzá na-amịta mmiri okooko osisi site n’ibekwasị kpọmkwem n’elu ifuru na iji ọnụ ya dị ogologo ma gbaa ngọ garuo n’olu okooko osisi. Ma ọ bụrụ na okooko osisi dị ogologo gabiga ókè nke na ọnụ ya agaghị eru ya, nzá pụrụ ịtụpu ala ala okooko osisi ahụ ma mịrị mmiri ya dị oké ọnụ ahịa. Ha na-erikwa ụmụ ahụhụ ndị ha na-atụta n’elu okooko osisi na n’elu ahịhịa ndị dị nso.
Ndị nke oké bụkwa ndị ọkà n’ịgụ egwú. Egwú ha na-adị iche iche malite n’ụda nzá dị gịrịgịrị, nke na-adasi ike bụ́ tssp ruo na tsik-tsik-tsik-tsik-tsit trii-trii-tọrrrr mara mma nke nzá nwere ábụ́bà na-acha uhie uhie nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. Ọtụtụ mgbe ọ bụ egwú ha na-egosi na ha nọ n’oké ọhịa. Otú ọ dị, ozugbo a hụrụ ha, ha na-apụtakarị ìhè n’ala ahịhịa kpọrọ nkụ, nke na-acha nchara nchara nke Africa.
Ọ Dị Uchu Ma Ọ Maghị Oké Mma
Ọ bụ ezie na ọ bụ ihe obi ụtọ ikiri na ịṅa nzá nke oké ntị, nke nne na-adị nta karị, ọ dịghịkwa enwe àgwà na-egbukepụ egbukepụ. Ya mere ndị na-ekiri nnụnụ na ndị na-ese foto na-elegharakarị ya anya. N’ezie, a na-arịbakarị ya ama nanị mgbe ya na nke oké so. Ma ihe nke nne na-enweghị n’àgwà ka o nwere n’ezie n’ịdị uchu.
Ọ bụ nke nne na-akpakarị akwụ́ ma na-arụ ihe ka ukwuu kpọmkwem n’ọrụ ịzụ ụmụ ọhụrụ. Mgbe ọ na-arụ ọrụ ịkpa akwụ́, nke oké na-anọ na nche, dịrị njikere ịchụpụ ndị a na-achọghị n’ebe ahụ a na-akpa akwụ́.
Akwụ́ Ndị Koro n’Elu
Otú ọ dị, akwụ́ nzá adịghị ama mma ma ọlị. Ha na-eyikarị ụmụ irighiri ahịhịa nke ifufe bukọtara ọnụ ma kokwasị ya n’elu alaka osisi. N’ịbụ nke yiri sọks kokwasịrị n’elu, nke yiri ntapụ mmiri, e ji eriri nke ahịhịa a kpakọtara ọnụ kpaa akwụ́ nzá, jirikwa ngige ududo jikọta ya. A na-eji nkà jiri ụmụ obere alaka osisi, akwụkwọ ndị kpọrọ nkụ, ụmụ irighiri lichen, na ọtụtụ mgbe otu mkpo mkpụrụ osisi ma ọ bụ abụọ chọọ azụ akwụ́ ahụ mma.
N’ime ya, a na-edebe ahịhịa dị bịalị bịalị, ábụ́bà, na ihe ndị ọzọ dị nro n’ala akwụ́ ahụ. Ọnụ ụzọ ya na-abụ ntakịrị oghere dị n’otu akụkụ, n’ebe elu elu ya. Nke nne na-ekpukarị àkwá nanị ya. Ka ọ nọ n’akwụ́ ya yiri ube, a pụrụ ịhụ ogologo ọnụ ya gọrọ agọ ọtụtụ mgbe ka o si n’oghere nke akwụ́ ahụ pịpụta. Ọ na-eyi otu àkwá ma ọ bụ abụọ, bụ́ nke ga-abụ n’ime ihe dị ka ụbọchị 14. Mgbe ụmụ ọhụrụ ya hapụrụ akwụ́ ahụ, mgbe nile ha na-adị ka nne ha nke na-enweghị àgwà na-egbuke egbuke. Otú ọ dị, mgbe ndị nke oké malitere itozu okè, ha na-amalite irute ábụ́bà mara oké mma ndị ga-emesịa otu ụbọchị mee ka a mata ha dị ka nnụnụ nke anyanwụ.
Nzá bụ nanị ihe atụ ọzọ nke ụbara na ụdị ihe dị iche iche sitere n’aka Omenkà nwere ọgụgụ isi. Ịma mma nke àgwà ha na akparamàgwà ha sitere n’okike na-akpali anyị inwe ekele ka ukwuu maka Onye Okike ha. N’ihi ya nzá so n’ihe ndị Bible nyere iwu, sị: “Toonụ Jehova site n’ụwa, unu . . . ihe na-akpụ akpụ na nnụnụ nwere nku.” “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Ja.” (Abụ Ọma 148:7, 10; 150:6) Ihe ndị a dị oké ọnụ ahịa nke igwe Africa kwesịrị ịkpali anyị nile ito Onye Okike ahụ na-ahụ n’anya nke mere ha.